11 Mgbe o mesịrị, o fesara ụfọdụ n’ime ya n’ebe ịchụàjà ugboro asaa ma tee ebe ịchụàjà+ na arịa ya niile na efere ya nakwa ebe a na-adọkwasị ya mmanụ, iji doo ha nsọ.
38 O wee mee efere+ ọla kọpa iri. Ihe ga-eju efere nke ọ bụla bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat iri anọ. Efere nke ọ bụla dị kubit anọ. E nwere otu efere n’elu nke ọ bụla n’ihe iri ahụ e ji ebu ihe.