-
2 Ihe E Mere 30:9Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
9 N’ihi na ọ bụrụ na unu alọghachikwute+ Jehova, ụmụnne unu na ụmụ unu ga-aghọ ndị e kwesịrị imere ebere+ n’anya ndị dọọrọ ha n’agha, ha ga-ahapụkwa ha ka ha lọta n’ala a;+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-eme amara,+ na-emekwa ebere.+ Ọ gaghịkwa ewepụ ihu ya n’ebe unu nọ ma ọ bụrụ na unu alọghachikwute ya.”+
-
-
Nehemaya 9:17Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
17 Ha wee jụ ige ntị,+ ha echetaghịkwa+ ọrụ ebube gị niile ị rụụrụ ha, kama ha kwesiri olu ike+ wee họpụta onye ndú+ iji laghachi n’agbụ n’Ijipt. Ma ị bụ Chineke nke na-agbaghara mmehie,+ onye na-eme amara,+ na-emekwa ebere,+ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ+ na onye obiọma* ya dị ukwuu,+ ị hapụghịkwa ha.+
-