7 O mewo ka osisi vaịn mụ bụrụ ihe ijuanya,+ meekwa ka ihe fọdụrụ n’osisi fig mụ bụrụ naanị úkwù ya.+ Ọ tachasịwo ya ma tụfuo ya.+ Alaka ya na-achazi ọcha.
3 Ọkụ erepịawo ihe n’ihu ya,+ ire ọkụ na-erepịakwa ihe n’azụ ya.+ Ala nke dị n’ihu ya dị ka ogige Iden;+ ma ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu dị ya n’azụ, ọ dịghịkwa ihe na-agbanahụ ya.