4 Ma onye nchụàjà ahụ zara Devid, sị: “Ọ dịghị achịcha nkịtị m nwere, kama e nwere achịcha dị nsọ;+ ọ bụrụhaala na ụmụ okorobịa ahụ emetụghị nwaanyị aka.”+
5 Unu ajụla inye ya ibe unu,+ ọ gwụla ma ùnu kwekọrịtara maka oge a kara aka,+ ka unu wee tinye oge n’ikpe ekpere wee nọkọọ ọzọ, ka Setan wee ghara ịnọ na-anwa unu ọnwụnwa+ maka na unu enweghị ike ịchịkwa onwe unu.+