12 “Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị;+ ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na ịnyịnya ibu gị wee zuo ike, ka nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa wee nweta ume.+
14 Ma iwe were onyeisi oche ụlọ nzukọ n’ihi na Jizọs gwọrọ ọrịa ahụ n’ụbọchị izu ike, o wee malite ịsị ìgwè mmadụ ahụ: “E nwere ụbọchị isii e kwesịrị ịrụ ọrụ n’ime ha;+ ya mere, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ unu, ọ bụghị n’ụbọchị izu ike.”+