3 Ị ga-arụ ite ya maka ikpopụ ntụ nke ya na abụba gwakọtara, rụọkwa shọvel ya, na ọkwá ya, na ndụdụ ya, na ihe ịgụ ọkụ ya; ị ga-eji ọla kọpa rụọ arịa ya niile.+
12 ọ ga-ahụ na e bupụrụ ha dum ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu+ wee buga ha n’ebe dị ọcha, n’ebe a na-awụsa ntụ nke ya na abụba gwakọtara,+ ọ ga-atụkwasị ha n’elu nkụ kpọọ ha ọkụ.+ N’ebe a na-awụsa ntụ nke ya na abụba gwakọtara ka a ga-akpọ ha ọkụ.