Ọpụpụ 24:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 E mesịa, o zipụrụ ụmụ okorobịa bụ́ ụmụ Izrel, ha wee chụọ àjà nsure ọkụ, jirikwa oké ehi dị iche iche chụọrọ Jehova àjà nkịtị na àjà udo.+ Levitikọs 1:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 “Gwa ụmụ Izrel okwu,+ sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu chọrọ iji anụ ụlọ chụọrọ Jehova àjà, unu ga-eji anụ si n’ìgwè ehi nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ chụọ àjà unu.
5 E mesịa, o zipụrụ ụmụ okorobịa bụ́ ụmụ Izrel, ha wee chụọ àjà nsure ọkụ, jirikwa oké ehi dị iche iche chụọrọ Jehova àjà nkịtị na àjà udo.+
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu,+ sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu chọrọ iji anụ ụlọ chụọrọ Jehova àjà, unu ga-eji anụ si n’ìgwè ehi nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ chụọ àjà unu.