15 Otu n’ime ha ga-ekpoju ntụ ọka nke àjà ọka ahụ e gwere nke ọma ọbụ aka ya, ya na mmanụ ya na frankinsens niile a tụkwasịrị n’elu àjà ọka ahụ, ọ ga-esurekwa ya n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà dị ka àjà na-esi ísì ụtọ nye Jehova, ka o wee bụrụ ihe ncheta ya.+