21 Jehova wee nụ ísì ụtọ,+ Jehova wee sị n’obi ya:+ “Agaghị m akọcha ala ọzọ+ n’ihi mmadụ, n’ihi na ọchịchọ+ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa;+ ọ dịghịkwa mgbe m ga-eti ihe niile dị ndụ ihe otiti dị nnọọ ka m mere.+
41 Ị ga-achụkwa nwa ebule nke abụọ ahụ n’àjà ná mgbede. Ị ga-achụ ya n’àjà, ya na àjà ọka+ nke dị ka nke a na-achụ n’ụtụtụ nakwa àjà ihe ọṅụṅụ nke dị ka àjà ihe ọṅụṅụ ya, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ, àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ.
2 na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya+ ma nyefee onwe ya maka unu dị ka onyinye+ na àjà, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ+ nye Chineke.