Ndị Efesọs
5 Ya mere, ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke,+ dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, 2 na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya+ ma nyefee onwe ya maka unu dị ka onyinye+ na àjà, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ+ nye Chineke.
3 Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko+ na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu+ aha n’etiti unu,+ dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ;+ 4 ma ọ bụ omume ihere+ ma ọ bụ okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ,+ bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị, kama nke ahụ ikele Chineke.+ 5 N’ihi na unu maara nke a, unu onwe unu ghọtakwara na ọ dịghị onye na-akwa iko+ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye anyaukwu+—nke pụtara ịbụ onye na-ekpere arụsị—nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze nke Kraịst na nke Chineke.+
6 Unu ekwela ka mmadụ ọ bụla jiri okwu efu ghọgbuo unu,+ n’ihi na ọ bụ n’ihi ihe ndị ahụ e bu ụzọ kwuo ka ọnụma nke Chineke na-abịakwasị ụmụ nnupụisi.+ 7 Ya mere, unu na ha enwekọla ihe ọ bụla;+ 8 n’ihi na unu bụbu ọchịchịrị,+ ma ugbu a unu bụ ìhè+ n’ime Onyenwe anyị. Na-ejenụ ije dị ka ụmụ nke ìhè, 9 n’ihi na mkpụrụ nke ìhè ahụ bụ ụdị ịdị mma ọ bụla na ụdị ezi omume ọ bụla na ụdị eziokwu ọ bụla.+ 10 Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma;+ 11 kwụsịkwanụ iso ha na-ekere òkè+ n’ọrụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ ndị dịịrị ọchịchịrị,+ ma, kama nke ahụ, ọbụna na-akatọnụ+ ha, 12 n’ihi na ihe ndị ha na-eme na nzuzo na-emedị ihere ịkọ akọ.+ 13 Ìhè ahụ na-emekwa ka ihe niile a na-akatọ akatọ+ pụta ìhè, n’ihi na ihe ọ bụla nke a na-eme ka ọ pụta ìhè+ bụ ìhè. 14 Ya mere, ọ na-ekwu, sị: “Teta,+ gị onye na-arahụ ụra, sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+ Kraịst ga-enwukwasịkwa+ gị.”
15 Ya mere, na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije+ ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, 16 na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị,+ n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.+ 17 N’ihi nke a, kwụsịnụ ịbụ ndị na-enweghị ezi uche, kama nọgidenụ na-aghọta+ ihe uche+ Jehova bụ. 18 Unu adịkwala na-aṅụbiga mmanya ókè,+ nke ndụ ịla n’iyi dị na ya,+ kama na-ejupụtanụ na mmụọ nsọ,+ 19 jirinụ abụ ọma+ na ito+ Chineke na abụ ime mmụọ na-agwa ibe unu okwu, na-abụ abụ+ ma na-agụ egwú olu ụtọ+ n’obi unu nye Jehova, 20 na-ekele+ Chineke bụ́ Nna anyị mgbe niile maka ihe niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.
21 Na-edonụ onwe unu n’okpuru ibe unu+ n’ịtụ egwu Kraịst. 22 Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru+ ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, 23 n’ihi na di bụ isi nke nwunye+ ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ,+ ebe ọ bụ onye nzọpụta nke ahụ́ a. 24 N’eziokwu, dị ka ọgbakọ ahụ si na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst, ka ndị bụ́ nwunye sikwa otú ahụ na-edo onwe ha n’okpuru di ha n’ihe niile.+ 25 Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya,+ 26 ka o wee doo ya nsọ,+ jirikwa mmiri saa ya wee mee ka ọ dị ọcha site n’okwu Chineke,+ 27 ka o wee chee ọgbakọ ahụ n’ihu onwe ya n’ịma mma ya,+ n’enweghị ntụpọ ma ọ bụ ahụ́ ndọlị ma ọ bụ ihe ọ bụla dị otú ahụ, kama ka o wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.+
28 N’ụzọ dị otú a, ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, 29 n’ihi na ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya,+ dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya, 30 n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke ahụ́ ya.+ 31 “N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.”+ 32 Ihe nzuzo a dị nsọ+ dị ukwuu. Ana m ekwu banyere Kraịst na ọgbakọ.+ 33 Otú ọ dị, ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya+ dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.+