2 N’ihi na ana m ekworo unu ekworo yiri ekworo Chineke,+ n’ihi na mụ onwe m kwere unu nkwa na otu di+ ga-alụ unu+ ka m wee chee unu n’ihu Kraịst+ dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ.+
22 ọ bụ unu ka o mere ugbu a ka unu na ya dị ná mma+ site n’anụ ahụ́ nke onye ahụ, site n’ọnwụ ya,+ ka o wee chee unu n’ihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị na-enweghị mmerụ+ na ndị a na-adịghị ebo ebubo+ n’ihu ya,
22 ka anyị jiri ezi obi na-abịaru nso, nwee obi ike zuru ezu na okwukwe, ebe e fesaworo mmiri dị ọcha n’obi anyị ka ọ ghara inwe ajọ akọ na uche,+ jirikwa ya sachaa ahụ́ anyị.+
27 Ma ihe ọ bụla na-adịghị nsọ na onye ọ bụla nke na-eme ihe arụ,+ nke na-aghakwa ụgha,+ agaghị abanye n’ime ya ma ọlị;+ ọ bụ naanị ndị e dere aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ ga-abanye n’ime ya.+