2 Ahụkwara m obodo nsọ ahụ,+ bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ka o si n’eluigwe,+ n’ebe Chineke nọ, na-agbadata. A kwadebekwara ya dị ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ nke a chọrọ mma maka di ya.+
17 Mmụọ nsọ+ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị: “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: “Bịa!”+ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa;+ onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.+