38 Ọ ga na-adị n’egedege ihu Erọn, Erọn ga-azakwa ajụjụ maka njehie e jehiere n’ihe metụtara ihe dị nsọ,+ ndị ụmụ Izrel ga-edo nsọ, ya bụ, onyinye ha niile dị nsọ; ọ ga-adịkwa n’egedege ihu ya mgbe niile, iji na-enwetara ha ihu ọma Jehova.+
32 Unu agaghị ebutere onwe unu mmehie n’ihi ya ma ọ bụrụ na unu enye ihe kasị mma n’ime ha n’onyinye, unu emerụkwala ihe nsọ nke ụmụ Izrel, ka unu wee ghara ịnwụ.’”+
19 “Ị ga-edo nke ọ bụla bụ́ oké e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ gị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke gị.+ Ejila ehi gị e bu ụzọ mụọ rụọ ọrụ, akpachakwala ajị ewu na atụrụ gị e bu ụzọ mụọ.+