50 Gị onwe gị, họpụta ndị Livaị ka ha na-elekọta ụlọikwuu Ihe Àmà+ na arịa ya niile na ihe niile metụtara ya.+ Ọ bụ ha ga na-ebu ụlọikwuu ahụ na arịa+ ya niile, ọ bụ ha ga na-eje ozi+ na ya; ha ga-amakwa ụlọikwuu gburugburu ụlọikwuu ahụ.+
9 Ọ̀ bụụrụ unu ntakịrị ihe na Chineke Izrel si ná nzukọ Izrel kewapụta+ unu iji chee unu n’ihu onwe ya ka unu wee na-eje ozi metụtara ụlọikwuu Jehova nakwa ka unu na-eguzo n’ihu nzukọ a na-ejere ha ozi,+