19 Onye ahụ dị ọcha ga-efesa ya n’ahụ́ onye ahụ na-adịghị ọcha n’ụbọchị nke atọ nakwa n’ụbọchị nke asaa, sachapụ ya mmehie ya n’ụbọchị nke asaa;+ ọ ga-eji mmiri sụọ uwe ya, saakwa ahụ́, ọ ga-adịkwa ọcha ná mgbede.
20 “‘Ma onye na-adịghị ọcha, nke na-emeghịkwa onwe ya ka ọ dị ọcha, a ga-ebipụ+ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ọgbakọ unu, n’ihi na ọ bụ ebe nsọ Jehova ka o merụrụ. E fesaghị ya mmiri e ji eme ka mmadụ dị ọcha. Ọ dịghị ọcha.