12 Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom na ohu unu ndị ikom na ohu unu ndị inyom na onye Livaị nke bi n’obodo unu, n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o nwere n’etiti unu.+
14 Ọ bụ naanị ebo Livaị ka ọ na-enyeghị ihe nketa.+ Àjà Jehova bụ́ Chineke Izrel nke a na-esure n’ọkụ+ bụ ihe nketa ha,+ dị nnọọ ka o kwere ha ná nkwa.+