8 Jehova wee gwa Erọn okwu ọzọ, sị: “Lee, mụ onwe m enyewo gị ọrụ ịhụ maka onyinye a na-enye m.+ Ọ bụ ya bụ òkè m nyere gị na ụmụ gị n’ime ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ òkè unu ruo mgbe a na-akaghị aka.+
19 Onyinye+ niile dị nsọ, nke ụmụ Izrel ga na-enye Jehova, ka m nyere gị na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom, ka ọ bụrụ òkè unu ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihu Jehova maka gị na ụmụ gị.”+