18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ,+ o wee sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo n’osimiri ukwu, bụ́ osimiri Yufretis:+
8 M ga-enyekwa gị na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị ala dị iche iche i biri dị ka ọbịa,+ bụ́ ala Kenan dum, ka ọ bụrụ ihe onwunwe gị ruo mgbe a na-akaghị aka; m ga-egosikwa na m bụ Chineke ha.”+