3 Biri dị ka ọbịa n’ala a,+ m ga-anọnyere gị, m ga-agọzikwa gị, n’ihi na ọ bụ gị na mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a niile,+ m ga-emezukwa iyi m ṅụụrụ Ebreham nna gị,+
24 N’ikpeazụ, Josef sịrị ụmụnne ya: “Anwụwala m; ma Chineke aghaghị iche ihu ya n’ebe unu nọ,+ ọ ga-akpọpụta unu n’ala a wee kpọga unu n’ala ọ ṅụụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi inye ha.”+
5 Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova kpọbatara gị n’ala ndị Kenan na nke ndị Het na nke ndị Amọraịt na nke ndị Haịvaịt na nke ndị Jibọs,+ bụ́ nke ọ ṅụụrụ nna nna gị hà iyi inye gị,+ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ mgbe ahụ ị ga-eme ememme a n’ọnwa a.