29 “Ọ ga-abụrụ unu ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka:+ N’ọnwa nke asaa, n’abalị iri n’ọnwa ahụ,+ unu ga-emekpa mkpụrụ obi unu ahụ́,+ unu arụla ọrụ ọ bụla,+ ma nwa afọ ma onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu.
15 Ma mkpụrụ obi ọ bụla nke riri anụ nwụworo anwụ ma ọ bụ nke anụ ọhịa dọgburu,+ ma ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ bụ mbịarambịa, ọ ga-asụ uwe ya, saakwa ahụ́ na mmiri wee bụrụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede;+ ọ ga-aghọkwa onye dị ọcha.
14 “‘Ọ bụrụ na e nwere onye mbịarambịa binyeere unu dị ka ọbịa ma ọ bụ onye bi n’etiti unu, n’ọgbọ unu niile, ọ ga na-achụ àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ, dị nnọọ ka unu kwesịrị ime, otú ahụ ka o kwesịrị ime.+