15 Otú ọ dị, mgbe chi bọrọ, ndị mmụọ ozi ahụ malitere ịgwa Lọt ka o mee ngwa ngwa, sị: “Bilie! Kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ bụ́ ndị nọ n’ebe a,+ ka a ghara ibibi gị mgbe a na-ebibi obodo a n’ihi njehie ya!”+
4 M wee nụ ka olu ọzọ nke si n’eluigwe na-asị: “Ndị nke m,+ sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya,+ ma ọ bụrụkwa na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.