Diuterọnọmi 8:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ị makwaara nke ọma n’obi gị na dị nnọọ ka mmadụ si agbazi nwa ya nwoke, otú ahụ ka Jehova bụ́ Chineke gị nọ na-agbazi gị.+ Ilu 13:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+ Ilu 19:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Nye nwa gị ntaramahụhụ mgbe olileanya ka dị;+ ekwekwala ka igbu ya gụọ mkpụrụ obi gị agụụ.+ Ilu 23:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.+ Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ. Ndị Hibru 12:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ọ dịkwa mgbe anyị nwere ndị nna anyị na ha bụ anụ ahụ́, ndị na-adọ anyị aka ná ntị,+ anyị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ̀ bụ na anyị agaghị edo onwe anyị n’okpuru Nna nke ndụ ime mmụọ anyị karị wee dịrị ndụ?+
5 Ị makwaara nke ọma n’obi gị na dị nnọọ ka mmadụ si agbazi nwa ya nwoke, otú ahụ ka Jehova bụ́ Chineke gị nọ na-agbazi gị.+
24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+
9 Ọ dịkwa mgbe anyị nwere ndị nna anyị na ha bụ anụ ahụ́, ndị na-adọ anyị aka ná ntị,+ anyị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ̀ bụ na anyị agaghị edo onwe anyị n’okpuru Nna nke ndụ ime mmụọ anyị karị wee dịrị ndụ?+