6 N’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu.+ Ọ bụ unu ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.+
9 Jehova ga-eme ka unu guzosie ike ịbụrụ ya ndị dị nsọ,+ dị nnọọ ka ọ ṅụụrụ gị n’iyi,+ n’ihi na ị na-edebe ihe Jehova bụ́ Chineke gị nyere n’iwu,+ i wee na-eje ije n’ụzọ ya.