21 “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme+ uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.+
25 Ma onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè+ nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ+ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.+