4“Ugbu a, Izrel, gee ntị n’ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị m na-akụziri unu ka unu debe, ka unu wee dị ndụ,+ ka unu wee banyekwa ma weghara ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-enye unu.
13 Ọ bụkwa n’Ugwu Saịnaị ka ị gbadatara+ wee gwa ha okwu site n’eluigwe+ ma gaa n’ihu inye ha mkpebi ikpe ziri ezi+ na iwu eziokwu,+ ụkpụrụ dị mma+ na ntụziaka.+