Ilu 3:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya,+ mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.+ Matiu 5:42 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 42 Mmadụ rịọ gị ihe, nye ya, agbakụtakwala onye chọrọ ibite gị ihe n’akwụghị ọmụrụ nwa azụ.+ Luk 12:33 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 33 Reenụ+ ihe unu nwere ma were ya nye onyinye ebere.+ Meerenụ onwe unu obere akpa ego ndị na-adịghị aka aka, bụ́ akụ̀ nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe,+ ebe onye ohi na-adịghị eru nso, ebe nla na-adịghịkwa erichapụ. Ọrụ Ndịozi 2:45 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 45 Ha na-erekwa ihe onwunwe+ ha na akụ̀ ha ma na-ekesara mmadụ niile ihe ha retara n’ihe ndị a, dị nnọọ ka mkpa onye ọ bụla si dị.+
33 Reenụ+ ihe unu nwere ma were ya nye onyinye ebere.+ Meerenụ onwe unu obere akpa ego ndị na-adịghị aka aka, bụ́ akụ̀ nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe,+ ebe onye ohi na-adịghị eru nso, ebe nla na-adịghịkwa erichapụ.
45 Ha na-erekwa ihe onwunwe+ ha na akụ̀ ha ma na-ekesara mmadụ niile ihe ha retara n’ihe ndị a, dị nnọọ ka mkpa onye ọ bụla si dị.+