6 Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Atụla egwu, amakwala jijiji n’ihu ha,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka gị na ya so na-aga. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.”+
5 Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya,+ ka unu nọ na-enwe afọ ojuju+ n’ihe ndị dị ugbu a.+ N’ihi na o kwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”+