31 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ Chineke ebere.+ Ọ gaghị agbahapụ gị ma ọ bụ laa gị n’iyi ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ+ nna nna gị hà nke ọ ṅụụrụ ha n’iyi.
5 Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu gị ụbọchị niile nke ndụ gị.+ M ga-anọnyere gị dị nnọọ ka m nọnyeere Mozis.+ Agaghị m agbahapụ gị, agaghịkwa m ahapụ gị ma ọlị.+
5 Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya,+ ka unu nọ na-enwe afọ ojuju+ n’ihe ndị dị ugbu a.+ N’ihi na o kwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”+