12 Unu ekenyekwala ụmụ ha ndị ikom+ ụmụ unu ndị inyom, unu alụtarala ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom; unu emekwala ihe ga-ewetara ha udo+ na ọganihu, ruo mgbe a na-akaghị aka, ka unu wee dị ike+ ma rie ihe ọma dị n’ala ahụ ma weghara ya maka ụmụ unu ruo mgbe a na-akaghị aka.’+