48 Abimelek wee gbagoo n’Ugwu Zalmọn,+ ya na ndị niile so ya. Abimelek wee were anyụike o ji n’aka gbute otu alaka osisi, buru ya tụkwasị n’ubu ya wee gwa ndị so ya, sị: “Ihe unu hụrụ m mere—ngwanụ, meenụ ya!”+
49 Onye ọ bụla n’ime ndị agha ahụ niile wee gbute otu alaka osisi ma soro Abimelek n’azụ. Ha wee tụkwasị ya n’ebe ahụ dị n’okpuru ala ma gbaa ụlọ ahụ ọkụ, ndị niile bi n’ụlọ elu Shikem wee nwụọ, ihe dị ka otu puku mmadụ, ma ndị ikom ma ndị inyom.+