25 Jehova ga-eme ka e merie gị n’ihu ndị iro gị.+ Otu ụzọ ka ị ga-esi gaa ibuso ha agha, ma ị ga-esi n’ụzọ asaa gbaa ọsọ n’ihu ha; ị ga-aghọkwa ihe ga-eme ka alaeze niile nke ụwa tụọ ụjọ.+
6 Ha gweriri ibe ha, otu mba gweriri mba ọzọ,+ otu obodo egweriekwa obodo ọzọ, n’ihi na Chineke tinyere ha n’ọgba aghara site n’ime ka ụdị nsogbu ọ bụla dakwasị ha.+