55 “‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị bi n’ala ahụ n’ihu unu,+ ndị unu hapụrụ n’ime ha ga-aghọ ogwu n’anya unu, ghọọkwa ogwu n’akụkụ abụọ unu, ha ga na-awakpo unu n’ala unu ga-ebi.+
47 Ókèala ụmụ Dan abaghị ha.+ Ụmụ Dan wee gbagoo buso Lishem agha,+ weghara ya ma jiri ihu mma agha bibie ya. Ha wee nweta ya ma biri na ya. Ha wee gụọ Lishem Dan, bụ́ aha Dan nna nna ha.+