25 Biko, ka onyenwe m ghara itinye uche na nwoke a na-abaghị n’ihe+ bụ́ Nebal, n’ihi na otú aha ya dị ka ya onwe ya dị. Nebal bụ aha ya, nzuzu dịkwa ya n’ahụ́.+ Ma mụ onwe m, bụ́ ohu gị nwaanyị, ahụghị ụmụ okorobịa onyenwe m, bụ́ ndị i zitere.
22 Ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn ga-eji ha na-abụ ọnụ, sị: “Ka Jehova mee ka ị dị ka Zedekaya na Ehab,+ bụ́ ndị eze Babịlọn gbara ọkụ!”+