Abụ Ọma 18:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova,Ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-etiku maka enyemaka.+O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,+Mkpu enyemaka m tiri n’ihu ya wee ruo ya ntị.+ Abụ Ọma 27:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Jehova bụ ìhè m+ na nzọpụta m.+Ònye ka m ga-atụ egwu?+Jehova bụ idé ji ndụ m.+Ònye ka m ga-atụ ụjọ?+ Abụ Ọma 31:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Jehova, agbabawo m n’ime gị.+Biko, ekwela ka ihere mee m ma ọlị.+Meere m ụzọ mgbapụ n’ihi ezi omume gị.+ Abụ Ọma 31:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Meere m amara, Jehova, n’ihi na anọ m n’oké ihe isi ike.+Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi iru uju,+ ike agwụla mkpụrụ obi m, gwụkwa afọ m.+ Abụ Ọma 34:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Ọdachi ndị na-adakwasị onye ezi omume dị ọtụtụ,+Ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.+ Abụ Ọma 43:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m?Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.+ Abụ Ọma 56:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 M ga-adabere na Chineke wee too okwu ya.+Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịrị obi; m gaghị atụ egwu.+Gịnị ka anụ ahụ́ bụ́ mmadụ ga-eme m?+ Abụ Ọma 143:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Echetawo m oge dị anya gara aga;+Atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum;+Eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.+ Ilu 18:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike.+ N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.+ Habakọk 3:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova;+ m ga-enwe aṅụrị n’ime Chineke nke nzọpụta m.+ Luk 22:43 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 43 Otu mmụọ ozi nke si n’eluigwe pụtara ìhè n’ihu ya wee mee ka ọ dị ike.+
6 N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova,Ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-etiku maka enyemaka.+O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,+Mkpu enyemaka m tiri n’ihu ya wee ruo ya ntị.+
27 Jehova bụ ìhè m+ na nzọpụta m.+Ònye ka m ga-atụ egwu?+Jehova bụ idé ji ndụ m.+Ònye ka m ga-atụ ụjọ?+
31 Jehova, agbabawo m n’ime gị.+Biko, ekwela ka ihere mee m ma ọlị.+Meere m ụzọ mgbapụ n’ihi ezi omume gị.+
9 Meere m amara, Jehova, n’ihi na anọ m n’oké ihe isi ike.+Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi iru uju,+ ike agwụla mkpụrụ obi m, gwụkwa afọ m.+
5 Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m?Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.+
4 M ga-adabere na Chineke wee too okwu ya.+Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịrị obi; m gaghị atụ egwu.+Gịnị ka anụ ahụ́ bụ́ mmadụ ga-eme m?+
5 Echetawo m oge dị anya gara aga;+Atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum;+Eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.+