17 Eze wee gwa ndị ọgba ọsọ+ guzo ya gburugburu, sị: “Tụgharịanụ gbuo ndị nchụàjà Jehova, n’ihi na ha dụnyeere Devid úkwù nakwa n’ihi na ha maara na ọ gbara ọsọ ma ha akọghịrị m ya!”+ Ndị na-ejere eze ozi achọghị isetị aka ha wakpo ndị nchụàjà Jehova.+