8 Ndị a niile na-ejere gị ozi ga-agbadata bịakwute m wee daara m n’ala,+ sị, ‘Gawa, gị na ndị niile na-agbaso nzọụkwụ gị.’ E mesịa, m ga-agawa.” O wee jiri oké iwe si n’ebe Fero nọ pụọ.
19 O wee ruo na ngwa ngwa Mozis rutere nso n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu wee hụ nwa ehi+ ahụ na egwú a na-agba, iwe ya malitere ịdị ọkụ, ozugbo ahụ, ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ n’aka ya wee kụrie ha n’ala ala ugwu ahụ.+