17 N’ikpeazụ, Sọl sịrị Devid: “Lee ada m bụ́ Mirab.+ Ọ bụ ya ka m ga-akpọnye gị ka ọ bụrụ nwunye gị.+ Naanị gosi m na ị bụ dike, lụọkwa agha Jehova.”+ Ma Sọl gwara onwe ya, sị: “Ka m ghara ịkpa ya aka, kama ka ọ bụrụ ndị Filistia ga-akpa ya aka.”+
25 Sọl wee sị: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa Devid, ‘Ọ bụghị ego isi nwaanyị+ ka eze chọrọ, kama ọ bụ otu narị apị́+ ndị Filistia, ka eze wee bọọrọ onwe ya ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro ya.” Ma Sọl kpara nkata ka ndị Filistia gbuo Devid.