8 O wee gaa n’ihu ịsị ha: “Jirinụ ọtụtụ akụ̀ na ọtụtụ anụ ụlọ laghachi n’ụlọikwuu unu, jirikwanụ ọlaọcha na ọlaedo na ọla kọpa na ígwè na uwe dị nnọọ ukwuu.+ Werenụ òkè unu n’ihe a kwatara+ n’aka ndị iro unu, unu na ụmụnne unu.”
22 Ma, lee, Joab na ndị na-ejere Devid ozi si n’ebe ha gara mwakpo na-alọta, ihe ha kwatara+ dịkwa ukwuu. Ma Abna esoghị Devid nọrọ na Hibrọn, n’ihi na ọ hapụla ya ka ọ laa, ọ lawakwara n’udo.