14 Ozugbo ahụ, Devid gwara ndị niile na-ejere ya ozi bụ́ ndị ya na ha nọ na Jeruselem, sị: “Bilienụ, ka anyị gbapụ;+ n’ihi na anyị agaghị enwe ụzọ mgbapụ n’ihi Absalọm! Meenụ ọsọ ọsọ, ka ọ ghara ime ngwa ngwa chụkwute anyị wee mee ka ihe ọjọọ dakwasị anyị, jirikwa ihu mma agha bibie obodo a!”+