16 O wee sị: “N’ezie, m na-ahụ ka a chụsasịrị ndị Izrel niile n’ugwu, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ Jehova wee sị: ‘Ọ dịghị ndị nwe ndị a.+ Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’”+
9 Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka ná ntị ka ọ hapụ ụzọ ya, ma ọ hapụghị ụzọ ya, ya onwe ya ga-anwụ ná njehie ya,+ ma gị onwe gị ga-anapụta mkpụrụ obi gị.+