Ezikiel
33 Okwu Jehova wee ruo m ntị, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, gwa ụmụ ndị gị okwu,+ sị ha,
“‘Ọ bụrụ na mụ emee ka mma agha bịakwasị ala ọ bụla,+ ọ bụrụkwa na ndị ala ahụ, ha niile, akpọrọ otu nwoke mee ya onye nche ha,+ 3 o wee hụ mma agha ahụ ka ọ na-abịakwasị ala ahụ wee fụọ opi, dọọkwa ndị mmadụ aka ná ntị,+ 4 onye ọ bụla nke nụrụ ụda opi ahụ ma ọ naraghị ịdọ aka ná ntị ma ọlị,+ mma agha wee bịa gbuo ya, ọbara ya ga-adị ya n’isi.+ 5 Ọ nụrụ ụda opi ahụ, ma ọ naraghị ịdọ aka ná ntị. Ọbara ya ga-adị ya n’isi. A sị na ọ naara ịdọ aka ná ntị, mkpụrụ obi ya gaara alanahụ.+
6 “‘Ma ọ bụrụ na onye nche ahụ hụrụ mma agha ka ọ na-abịa, wee jụ ịfụ opi,+ ọ dọghịkwa ndị mmadụ aka ná ntị ma ọlị, mma agha ahụ wee bịa gbuo mkpụrụ obi ọ bụla n’etiti ha, a ga-egbu mkpụrụ obi ahụ n’ihi njehie ya,+ ma m ga-ajụta ọbara ya n’aka onye nche ahụ.’+
7 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ọ bụ onye nche ụlọ Izrel ka m mere gị,+ ị ga-anụkwa okwu n’ọnụ m ma dọọ ha aka ná ntị dị ka m gwara gị.+ 8 Mgbe m sịrị onye ajọ omume, ‘Gị onye ajọ omume, ị ghaghị ịnwụ!’+ ma i kwughị okwu iji dọọ onye ajọ omume ahụ aka ná ntị ka ọ hapụ ụzọ ya,+ ya onwe ya ga-anwụ ná njehie ya dị ka onye ajọ omume,+ ma n’aka gị ka m ga-ajụta ọbara ya. 9 Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka ná ntị ka ọ hapụ ụzọ ya, ma ọ hapụghị ụzọ ya, ya onwe ya ga-anwụ ná njehie ya,+ ma gị onwe gị ga-anapụta mkpụrụ obi gị.+
10 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, sị, ‘Unu onwe unu asịwo: “Ebe ọ bụ na nnupụisi anyị na mmehie anyị dị anyị n’isi, ọ bụkwa n’ime ha ka anyị na-erekasị,+ oleezi otú anyị ga-esi dịrị ndụ?”’+ 11 Sị ha, ‘“Dị nnọọ ka m dị ndụ,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọnwụ onye ajọ omume adịghị atọ m ụtọ,+ kama ihe na-atọ m ụtọ bụ ka onye ajọ omume hapụ+ ụzọ ya ma dịrị ndụ.+ Chigharịanụ, hapụnụ ụzọ ọjọọ unu.+ Gịnị mere unu ga-eji nwụọ, unu ụlọ Izrel?”’+
12 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, gwa ụmụ ndị gị, sị, ‘Ezi omume nke onye ezi omume agaghị anapụta ya n’ụbọchị o nupụrụ isi.+ Ma a bịa n’ajọ omume nke onye ajọ omume, ọ gaghị eme ka ọ sụọ ngọngọ n’ụbọchị ọ hapụrụ ajọ omume ya.+ Onye ọ bụla nke na-eme ezi omume apụghị ịdịrị ndụ n’ihi ya n’ụbọchị o mere mmehie.+ 13 Mgbe m sịrị onye ezi omume: “Ị ghaghị ịnọgide na-adị ndụ,” o wee tụkwasị obi n’ezi omume ya, mewe ihe na-ezighị ezi,+ a gaghị echeta ezi omume niile o mere, kama n’ihi ihe na-ezighị ezi o mere—ọ ga-anwụ n’ihi ya.+
14 “‘Mgbe m sịkwara onye ajọ omume: “Ị ghaghị ịnwụ,”+ o wee hapụ mmehie ya,+ mewe ihe ziri ezi na ezi omume,+ 15 onye ajọ omume ahụ wee weghachi ihe e ji gbaa ibé,+ kwụọ ụgwọ ihe ọ pụnaara mmadụ,+ jeekwa ije n’ụkpụrụ nke ndụ wee ghara ime ihe na-ezighị ezi,+ ọ ga-anọgide na-adị ndụ.+ Ọ gaghị anwụ. 16 A gaghị echeta mmehie ya ọ bụla wee mee ya ihe n’ihi ya.+ Ọ bụ ihe ziri ezi na ezi omume ka ọ nọ na-eme. Ọ ga-anọgide na-adị ndụ.’+
17 “Ụmụ ndị gị sịrị, ‘Ụzọ Jehova ezighị ezi,’+ ma, ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.
18 “Mgbe onye ezi omume hapụrụ ezi omume ya, mewe ihe na-ezighị ezi, ọ ga-anwụ n’ihi ya.+ 19 Mgbe onye ajọ omume hapụrụ ajọ omume ya, mewe ihe ziri ezi na ezi omume, ọ ga-anọgide na-adị ndụ n’ihi ya.+
20 “Unu sịkwara, ‘Ụzọ Jehova ezighị ezi.’+ Unu ụlọ Izrel, m ga-ekpe unu ikpe,+ onye ọ bụla dị ka ụzọ ya si dị.”
21 O wee ruo mgbe a dọrọsịịrị anyị n’agha, n’afọ nke iri na abụọ ya, n’ọnwa nke iri, n’abalị ise n’ọnwa ahụ, na onye si na Jeruselem gbapụta bịakwutere m,+ sị: “E tikpọwo obodo ahụ!”+
22 Aka Jehova dịkwasịrị m ná mgbede tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa,+ O wee meghee ọnụ m tupu onye ahụ abịakwute m n’ụtụtụ. E meghere ọnụ m, m wee kwụsị ịgbachi nkịtị.+
23 Okwu Jehova wee ruo m ntị, sị: 24 “Nwa nke mmadụ, ndị bi n’ebe ndị a a lara n’iyi+ na-ekwu ọbụna banyere ala Izrel, sị, ‘Ebreham bụ naanị otu onye, n’agbanyeghị nke ahụ, o nwetara ala ahụ.+ Anyị dị ọtụtụ; e nyewokwa anyị ala ahụ ka ọ bụrụ ihe anyị ga-enweta.’+
25 “Ya mere, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Unu na-erikọta ọbara na anụ.+ Unu lekwasịkwara anya n’arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị.+ Unu nọkwa na-awụfu ọbara.+ N’ihi ya, ùnu kwesịrị inweta ala ahụ?+ 26 Unu adaberewo ná mma agha unu.+ Unu emewo ihe arụ,+ onye ọ bụla n’ime unu emetọwokwa nwunye nwoke ibe ya.+ N’ihi ya, ùnu kwesịrị inweta ala ahụ?”’+
27 “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Dị nnọọ ka m dị ndụ, n’ezie, a ga-eji mma agha gbuo ndị niile nọ n’ebe ndị ahụ a lara n’iyi.+ M ga-ewere onye ọ bụla nọ n’ọhịa nye anụ ọhịa ka ọ bụrụ nri ya;+ ọ bụkwa ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị niile nọ n’ebe e wusiri ike nakwa n’ọgba.+ 28 M ga-emekwa ka ala ahụ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ ee, ebe tọgbọrọ nkịtị. A ga-emekwa ka ike ya nke na-ebu ya isi ghara ịdịkwa,+ meekwa ka ugwu ndị dị n’Izrel tọgbọrọ n’efu,+ ọ dịghị onye ga-esi na ha gafee. 29 Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m mere ka ala ahụ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ ọbụna ebe tọgbọrọ nkịtị, n’ihi ihe arụ niile ha mere.”’+
30 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ụmụ ndị gị na-agwa ibe ha okwu banyere gị n’akụkụ mgbidi nakwa n’ọnụ ụzọ ụlọ ha.+ Ha agwawo ibe ha okwu, onye nke ọ bụla agwawo nwanne ya, sị, ‘Biko, bịanụ nụrụ okwu si n’ọnụ Jehova pụta.’+ 31 Ha ga-abịakwute gị, dị ka ndị mmadụ si abịa, wee nọrọ ọdụ n’ihu gị dị ka ndị m.+ Ha ga-anụkwa okwu gị ma ha agaghị eme ya,+ n’ihi na ha ji ọnụ ha na-ekwupụta agụụ ihe ọjọọ na-agụ ha, ọ bụkwa n’uru na-ezighị ezi ka obi ha na-aga.+ 32 Ma, lee! ị dị ka abụ ịhụnanya na-atọ ụtọ n’anya ha, dị ka onye nwere olu ọma, onye na-akpọkwa ụbọ akwara nke ọma.+ Ha ga-anụkwa okwu gị, ma ọ dịghị onye ọ bụla ga-eme ya.+ 33 Mgbe ọ ga-emezu—lee! ọ ga-emezurịrị+—ha ga-amarakwa na onye amụma nọrọ n’etiti ha.”+