21 iji mezuo ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya,+ ruo mgbe ala ahụ debezuru ụbọchị izu ike o ji ụgwọ ya.+ O debere ụbọchị izu ike n’ụbọchị niile ọ tọgbọrọ n’efu ruo mgbe afọ iri asaa zuru.+
11 M wee sị: “Jehova, ruo ole mgbe?”+ O wee sị: “Ruo mgbe obodo niile ghọrọ mkpọmkpọ ebe, n’enweghị onye bi ha, ruo mgbe ụlọ niile na-enweghị mmadụ nọ ha, mgbe e bibiwokwara ala a mee ka ọ tọgbọrọ n’efu;+
2 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Unu onwe unu hụrụ ọdachi dum m mere ka ọ dakwasị Jeruselem+ na obodo niile dị na Juda, lee, taa, ha bụ ebe a lara n’iyi, ọ dịghịkwa onye bi n’ime ha.+