33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
14 M ga-emekwa ka unu zaa ajụjụ+ dị ka ihe unu metara si dị,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-esunye oké ọhịa ya ọkụ,+ ọ ga-erepịakwa ihe niile gbara ya gburugburu.’”+
24 ha ga-adakwa site n’ihu mma agha, a ga-adọrọkwa ha n’agha laa ná mba niile;+ ndị mba ọzọ ga-azọ Jeruselem ụkwụ, ruo mgbe oge a kara aka+ nke ndị mba ọzọ ga-ezu.