15 ọ bụrụ na unu ajụ ụkpụrụ m,+ ọ bụrụkwa na mkpụrụ obi unu akpọọ mkpebi ikpe m asị wee ghara ime ihe m nyere n’iwu, ruo n’ókè nke imebi ọgbụgba ndụ m,+
63 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+
11 Ndị Izrel niile emebiwokwa iwu gị, ha ahapụwo gị site n’ịjụ irube isi n’ihe i kwuru,+ i wee mee ka ọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi nke e dere n’iwu Mozis ohu ezi Chineke mezuo n’isi anyị,+ n’ihi na anyị emehiewo Ya.