10 Ya mere, m ga-akpọnye ndị ikom ọzọ ndị nwunye ha, nyefeekwa ubi ha n’aka ndị ga-eweghara ha;+ n’ihi na onye ọ bụla na-enweta uru na-ezighị ezi, malite n’onye kasị nta ruo ọbụna n’onye kasị ukwuu;+ onye ọ bụla na-aghọ aghụghọ, malite n’onye amụma ruo ọbụna n’onye nchụàjà.+