11 Ha bụ nkịta agụụ na-agụsi mkpụrụ obi ha ike;+ afọ adịghị eju ha eju.+ Ha bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta.+ Ha niile echewo ihu n’ụzọ nke ha, onye ọ bụla iji nweta uru na-ezighị ezi nke ya site n’ókè nke ala ya, na-asị:+
13 “N’ihi na onye ọ bụla n’ime ha na-enwetara onwe ya uru na-ezighị ezi, malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu;+ onye ọ bụla na-aghọ aghụghọ, malite n’onye amụma ruo n’onye nchụàjà.+
31 Ha ga-abịakwute gị, dị ka ndị mmadụ si abịa, wee nọrọ ọdụ n’ihu gị dị ka ndị m.+ Ha ga-anụkwa okwu gị ma ha agaghị eme ya,+ n’ihi na ha ji ọnụ ha na-ekwupụta agụụ ihe ọjọọ na-agụ ha, ọ bụkwa n’uru na-ezighị ezi ka obi ha na-aga.+
11 Ndị isi ya anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị,+ ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,+ ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego;+ ma n’ebe Jehova nọ ka ha dabeere, na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+