8 Ndị nchụàjà asịghị, ‘Olee ebe Jehova nọ?’+ Ndị iwu dị n’aka amaghị m;+ ndị ọzụzụ atụrụ mebikwara iwu m,+ ọbụna ndị amụma buru amụma n’aha Bel,+ ọ bụkwa ndị na-agaghị abara ha uru ọ bụla ka ha sooro.+
18 Ọ bụrụ na mụ abanye n’ọhịa, lee, e nwere ndị mma agha gburu!+ Ọ bụrụkwa na mụ abata n’ime obodo, lee, ụnwụ akpatawokwa ọrịa!+ N’ihi na ma ndị amụma ma ndị nchụàjà awagharịwo banye n’ala ha na-amaghị.’”+
5 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru megide ndị amụma na-eme ka ndị m kpafuo,+ ndị ọ na-abụ ha were ezé ha taa ihe,+ ha etie, ‘Udo!’+ ma ọ bụrụ na mmadụ etinyeghị ha ihe n’ọnụ, ha ebuso onye ahụ agha,*+
11 Ndị isi ya anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị,+ ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,+ ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego;+ ma n’ebe Jehova nọ ka ha dabeere, na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+