Jeremaya 5:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Ndị amụma na-ebu amụma ụgha;+ ndị nchụàjà na-eji ike ha emegbu ndị mmadụ.+ Ma ọ dị ndị m mma otú ahụ;+ gịnị ka unu ga-eme n’ikpeazụ?”+ Jeremaya 27:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 “‘“‘Ma unu egela ndị amụma unu+ na ndị na-agbara unu afa na ndị ọrọ nrọ unu+ na ndị na-emere unu anwansi na ndị dibịa afa unu,+ ntị, bụ́ ndị na-asị unu: “Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.”+ Abụ Ákwá 2:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ndị amụma gị ahụwo ọhụụ ihe na-abaghị uru na ihe na-adịghị enye afọ ojuju,+Ha ekpugheghị njehie gị iji mee ka a ghara ịdọrọ gị n’agha,+Kama nke ahụ, ha nọ na-ahụtara gị okwu na-abaghị uru na nke na-eduhie eduhie n’ọhụụ.+ Abụ Ákwá 4:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 N’ihi mmehie nke ndị amụma ya, njehie nke ndị nchụàjà ya,+Ndị na-awụfu ọbara ndị ezi omume nọ n’ime ya.+ Ezikiel 22:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 Ndị amụma ya etewo ha nzụ,+ na-ahụ ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ na-agbara ha afa ụgha,+ sị: “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru,” mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụla Jehova kwuru.
31 Ndị amụma na-ebu amụma ụgha;+ ndị nchụàjà na-eji ike ha emegbu ndị mmadụ.+ Ma ọ dị ndị m mma otú ahụ;+ gịnị ka unu ga-eme n’ikpeazụ?”+
9 “‘“‘Ma unu egela ndị amụma unu+ na ndị na-agbara unu afa na ndị ọrọ nrọ unu+ na ndị na-emere unu anwansi na ndị dibịa afa unu,+ ntị, bụ́ ndị na-asị unu: “Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.”+
14 Ndị amụma gị ahụwo ọhụụ ihe na-abaghị uru na ihe na-adịghị enye afọ ojuju,+Ha ekpugheghị njehie gị iji mee ka a ghara ịdọrọ gị n’agha,+Kama nke ahụ, ha nọ na-ahụtara gị okwu na-abaghị uru na nke na-eduhie eduhie n’ọhụụ.+
13 N’ihi mmehie nke ndị amụma ya, njehie nke ndị nchụàjà ya,+Ndị na-awụfu ọbara ndị ezi omume nọ n’ime ya.+
28 Ndị amụma ya etewo ha nzụ,+ na-ahụ ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ na-agbara ha afa ụgha,+ sị: “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru,” mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụla Jehova kwuru.