14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
6 “Ha ahụwo ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ afa ha gbakwara bụ ụgha, ha na-asị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru,’ mgbe ọ na-abụghị Jehova dunyere ha, ha echerewokwa ka ihe ha kwuru mezuo.+