11 Ya mere, ebe ọ bụ na unu na-anara onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ego maka ubi, unu na-anarakwa ya ụtụ, bụ́ nke ọ na-eji ọka atụ;+ unu ejiriwo nkume a wara awa rụọ ụlọ,+ ma unu agaghị anọgide na-ebi na ya; unu akọwo ubi vaịn ndị mara mma, ma unu agaghị aṅụ mmanya si na ha.+